Govt Etiti Akpugala Onye Jiburu Okwa Governor nakwa Okwa Minister Ala Anyi Huru Maka Mmanu Petrol Ulo Ikpe Maka Ebubo Agha Oluo Otunye Isi

Written by on April 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi dina aka ochichi President Bola Ahmed Tinubu agbala akwukwo na ulo ikpe Federal High Court dina Abuja megide onye ahu jiburu okwa minister ala anyi huru maka mmanu petrol ma burukwa onye jiburu okwa Governor Bayelsa State bu Timipre Sylva na ebubo ida iwu kana iwu megide ala anyi na udi nwa bekee kporo treason.

Ndi ozo sona onye a ochichi etiti gbara akwukwo megide gunyere: onye lagoro ezum ike nka na ogogo rank Maj Gen nke olu agha ala anyi, onye agha mmiri lagoro ezum ike nka na ogogo rank Navy Captain, otu onye uwe oji ka na olu na ogogo rank Police Inspector nakwa mmadu ato ndi ozo.

Ndi a ka ochichi etiti na ebo ebubo na aka ha dina oba ekere ede nyere atumatu iji nkwasu igbudu ndi agha akporo military coup kwatuo ochichi di ugbu a na ala anyi nakwa ebubo agha oluo otunye isi.

Habu ndi ozo ahu govt etiti gbara akwukwo ikpe a megide hana Timipre Sylva gunyeziri: Retd Maj Gen Mohammed Ibrahim Gana, Retd Navy Captain Erasmus Victor, Inspector Ahmed Ibrahim, nakwa Zekeri Umoru, gunyere Bukaru Goni hana Abdulkadir Sani.

Ozi kowaziri na obu echi bu Wednesday ka agba akpupu ndi a ulo ikpe na iru Justice Joyce Abdulmalik nona isi akwukwo ikpe a.

Ozi a kowara na obu ulo olu okaiwu izugbe ala anyi na okwa Attorney General of Federation gbara akwukwo ikpe a, ebe obu onye Director of Public Prosecutions DPP nke ogogo etiti Nigeria bu Rotimi Oyedepo SAN binyere ya aka na aha ochichi etiti.

Ka osiladi, ndi nta akuko nwetara ozi na yabu onye jiburu okwa Governor Bayelsa State ma jibukwuo okwa minister huru maka mmanu petrol bu Timipre Sylva ka nona oso ruo na oge ndeko akuko a taata bu Tuesday banyere yabu ebubo govt etiti jiri kpuga ha ulo ikpe.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited