Ochichi Etiti Ekwela Nkwa Ezi Udo Mmekorita Nyere Otu Jikoro Mba Ndi Ocha Maka Nkwalite Odimma Ala Anyi

Written by on April 24, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi nakwa otu jikoro mba nwa onye ocha nke European Union EU enwela mkpebi ezi udo mmekorita ikwalite ngalaba ndi gunyere: azum ahia, nchekwa, mmuta nakwa nka na uzu nyere obodo a bu Nigeria.

Nke a putara ihe site na onu Minister ogo nta ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu na ogbako nkuzi ihe 4th Dim Odumegwu Ojukwu Memorial Lecture were onodu na mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University dina Anambra State bukwanu ebe onye nnochite anya otu EU nyere ala anyi bu Nigeria nakwa mpaghara ECOWAS bu Amb Gautier Mignot noro nye nkuzi ihe na isiokwu metutara ezi onodu iru igwe.

Amb Odumegwu-Ojukwu kowara ogbako nkuzi a dika nke biara na mkpa ya ma elegara anya na oge a mba uwa niile na enwe ihe ima aka na iru nke nchekwa nakwa amaghi kwuru akuluba dika osiri metuta mgbanwe iru igwe.

Na oge ona akowa ezi onodu mmekorita mba na ibe ya dika nke bara uru nyere ibu agha megide ihe aka mgba na ogogo mba uwa ka yabu Minister kowara nsonyere onye nnochite anya otu EU na ogbako nkuzi ihe a dika ezi mgbaama mmekorita ka mma na etiti ala anyi nakwa yabu otu mba ndi ocha.

Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuputara na ala anyi a ga aga na iru na ezi mbo ya nyere nkwalite udo, nchekwa nakwa mmepe mba uwa dika osiri di na usoro otu ECOWAS nakwa ala isi oji Africa na izugbe ya.

Na nke ya ka yabu onye nnochite anya otu EU bu Amb Gautier Mignot kowara Amb Odumegwu-Ojukwu dika isi ahuru kwaba okpu nyere nkwalite udo mmekorita na etiti Nigeria nakwa EU.

Na oge ona akowa na ibu agha megide mgbanwe iru igwe galara onu ka Amb Mignot kwuputara na odachi so ya bu okaibe ma oburu na ebughi agha megide ya.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi unya bu Thursday ka onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister odimma mba ofesi na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr Magnus Ezeh mere ka amata na achikobara ogbako nkuzi ihe a bu ulo akwukwo mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University amara na mbu dika Anambra State University iji cheta ezi ukporo Dim Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu toro na elu uwa a oge ono ndu dika onye ndu ala Igbo niile nakwa onye isi ala Biafra oge ahu aluru agha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited