Tinubu Edegalara Ulo Nzuko Ukwu Senate Akwukwo Ayiyo Nkwado iga Bite Ego Ohuru Di Nari Nde Kwuru Nde Dollar

Written by on April 24, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu edegalara ulo nzuko ukwu Senate akwukwo ayiyo maka nkwado iga bite ego ohuru di nari nde Dollar ise na iri na isii na uma ato yabu; 5 Hundred and 16 point 3 Million US Dollars.

Nke a putara ihe unya bu Thursday na yabu akwukwo ayiyo onye isi ala degara onye isi izugbe ulo nzuko ukwu Senate na okwa Senate President bu Sen Godswill Akpabio ma buru nke aguputara na ogbako plenary habu ndi omebe iwu ogogo etiti unya.

Na ayiyo a ka President Tinubu kowara na obu na ulo oba ego Deutsche bank nke gazuru otutu mba uwa ka oga aga ibite ego ohuru a.

Onye isi ala kowara na nke a bu iji ruo olu ngo alaka okporo uzo Super Highway sitere Badagry nke Lagos State puo Sokoto State.

Ogara na iru mee ka amata na obu alaka di otu puku kilometers na yabu okporo uzo ka oga eji ego a ruo ma oburu na obite ya iji jiko mpaghara South West nakwa mgbago ugwu North West ala anyi.

Ka osiladi, na oge nririta uka nyere akwukwo ayiyo a ka habu ndi Senators kowara nke a dika ukwa dara na oge ya ma elegara anya na uru yabu okporo uzo bara nyere nkwalite akuluba.

Ka onutachara nririta uka ndi a ka Sen Godswill Akpabio nyefere ihe banyere ayiyo ego mbite ohuru a na aka otu Senate committee na ahu maka ego mbite na ala anyi nakwa mba ofesi ilebara ya anya ma weghachitere ulo nzuko ahu ozi na ime otu izu uka.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited