FRSC Adola Ndi Okpu Ugboala Aka Na Nti Banyere Oge Udummiri Anyi Nona Ime Ya

Written by on May 1, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Enyela ndi okpu ugboala ndumodu ka ha saa anya na mmiri nke oma ma huna ugboala ha nona ezi onodu tupu ha aputa olu na okporo uzo oge a abanyegoro na oge udu mmiri nke afo a bu 2026.

Ndumodu a putara ihe na Awka bu isi obodo Anambra State site na onu onye Sector Commander ulo olu njem awele okporo uzo Federal Road Safety Corps FRSC ngalaba ya nke State ahu bu Corps Commander Bridget Asekhauno oge yana ndi nta akuko na akari.

Corps Commander Asekhauno doro aka na nti sina okporo uzo na akawanye njo na ajo onodu mmichapu ukwu ugboala na oge mmiri ozuzu ma buru nke kpatara na ndi okpu ugboala gana asa anya ha na mmiri oge niile ha banyere na okporo uzo na udi oge a.

Okwuputara mmetuta ya megide ndi okpu ugboala kana eji ukwu ugboala nona onodu ojo abanye na okporo uzo iji ndu ha na nke ndi njem mere ihe egwuregwu.

Nwaanyi a nyekwara ndi okpu ugboala ndumodu ka ha belata oke oso na okporo uzo na oge udu mmiri a ma elegara anya na uzo niile edechago mmiri.

Na oge ona agwa ha ka hana aga ileta mana edozi ugboala ha oge niile ka Corps Commander Bridget Asekhauno kwuputara mkpa odi ndi okpu ugboala ihuna ihe nficha enyo ugboala ha akporo windscreen wipers na aru olu nke oma oge niile maka iji nye aka ka hana ahuta uzo nke oma na okporo uzo.

Corps Commander Asekhauno noro na oge ona ayo maka nrube isi na usoro nakwa iwu niile na achikwa njem okporo uzo kwe nkwa sina habu ndi Road Safety di uchu na olu ihuna echekwara ndu umu afo ala anyi na eme njem okporo uzo okachasi na oge udu mmiri a sagoro oku.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited