INEC Enyela Nzaghachi Na Nkabi Ikpe Ulo Ikpe Ekpecha Ogwu Ala Anyi Kabiri Banyere Otu Ndorondoro ADC.

Written by on May 1, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu ntule aka ochichi ala anyi bu Independent National Electoral Commission INEC akpatughariela aka na usoro igbe ndeko ya amara dika INEC Official Register ma denye aha Sen David Mark dika onye isi oche izugbe otu ndorondoro ochichi African Democratic Congress ADC, ebe odenyere aha Ogbeni Rauf Aregbesola jiburu okwa Governor Osun State dika ode akwukwo izugbe yabu otu ndorondoro ochichi.

Nke a ka ulo olu INEC mere dika nrube isi nyere nkabi ikpe ahu ulo ikpe ekpecha ogwu Supreme Court of Nigeria noro unya bu Thursday kabie nyere nghotahe ndi isi yabu otu ndorondoro na ogogo etiti.

Na oge ndi nta akuko mere nnyocha gaa na owa ozi onya nwududo ulo olu INEC na elekere iri na otu nke abali gara aga ka ahutara na yabu ulo olu ntule aka ochichi edenyego aha Sen David Mark jiburu okwa Senate President ala anyi dika National Chairman otu ndorondoro ADC, ma denye aha Aregbesola dika National Secretary yabu otu ndorondoro.

Ulo olu INEC gakwara na iru denye aha Dr Mani Ahmad dika National Treasurer otu ndorondoro a, ebe odenyere aha Akibu Dalhatu dika National Financial Secretary gunyere Prof Oserheimen Osunbor dika ADC National Legal Adviser.

Iga echeta na Supreme Court noro unya kachapu nkabi ikpe ulo ikpe mkpeghari Court of Appeal nyere na mbu bukwanu nke INEC ji noro oge ahu kachapu aha Sen Mark nakwa ndi otu ya dika ndi nchikwa otu ndorondoro ADC na ogogo etiti.

Na oge yabu ulo ikpe ekpecha ogwu na ekwuputa Sen Mark na ndi otu ya dika ndi iwu kwadogoduru na ogogo ADC National Working Committee ka ulo ikpe a nyere iwu ka anaghachi azu na ikpe ozo metutara otu ndorondoro a dina ulo ikpe Federal High Court.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited