Govt Etiti Ala Anyi Enyela Nkowa Onodu Umu Afo Nigeria Nona Mba South Africa Dika Osiri Metuta Amaghi Kwuru Na Mba Ahu

Written by on May 4, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi emela ka amata na onweghikwa nwa afo obodo a egburu na ngaghari iwe ahu anoro na odi nso a eme na mba South Africa emegide ndi obia na udi akporo anti-foreigner protests na olu bekee.

Ochichi etiti Nigeria gakwara na iru kowa na onweghi akuluba obuna bu nke nwa afo ala anyi emebiri na habu ngaghari iwe.

Ihe ndi a putara ihe site na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu uka na owa ozi mmekorita ohaneze bu minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu.

Amb Odumegwu-Ojukwu kowara na ochichi ala anyi doro anya na ala enyobara anya ka ihe siri aga dika osiri metuta yabu ngaghari iwe ana eme emegide ndi obia na ufodu mpaghara digasi na mba South Africa.

Okwuputara na onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu na enwe mmetuta nyere yabu onodu kpatara ojiri nye ntuzi aka ka akwalite udo mkpakorita ububo mba na ibe ya nyere yabu mba South Africa maka ogbugbo nyere onodu a.

Iga echetazi na anola na odi nso a ahuta onodu amaghi kwuru nke ngaghari iwe nakwa nkusu megide ndi obia na mba South Africa nke umu afo ala anyi nona mba ahu so eketa oke nkusu a kwere maka ujo habu ndi obia na udi akporo xenophobia na olu bekee.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited