Gov Nwifuru Akatola Ozi Ndi Ahu Na Akowa Na Omere Eseokwu Yana Sen Umahi
Written by admin on May 4, 2026
by Maduabuchi Onwe
Aka na achi Ebonyi state bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru akagbuola ozi ahu ana ebughari si na yana aka chiburu state ahu bu Sen David Nweze Umahi na enwe nnukwute ogbaghara ka odi ugbu a.
Ogakwara na iru mee ka amata na yabu ozi bu nke awara awa ugha iji bute ogbaghara na otu ndoro ndoro ochichi All Progressive Congress APC na Ebonyi state.
Nke a putara ihe site na ozi onye ode akwukwo mgbasa ozi nyere yabu Gov Nwifuru bu Dr. Monday Uzor nyefere ndi nta akuko unya bu uka na Abakaliki bu isi obodo state ahu.
Omeziri ka amata na governor Francis Ogbonna Nwifuru nakwa minister na ahu maka oru na Nigeria bu Sen Umahi ka bu nnu na mmanu nakwa ezigbote enyi na Nigeria.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.