Kalu, Mmadu Abuo Ozo Eturula Ugo Na Ntule Aka Ime Ulo APC Maka Okwa Senate Na Abia State

Written by on May 19, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nwa amadi ahu jiburu okwa Governor Abia State bu Sen Orji Uzor Kalu eturula ugo iji okoloto otu ndorondoro All Progressives Congress APC zogharia okwa ochichi nke ugboro ato ya na ntule aka ochichi izugbe afo ozo bu 2027 general elections dika Senator na anochite ogbonta vote Abia North Senatorial District na ulo nzuko ukwu Senate ala anyi.

Sen Uzor Kalu nke no ugbu a na ochichi nke ugboro abuo ya na yabu okwa nwetara nturu ugo a unya bu Monday na ntule aka ochichi ime ulo otu ndorondoro APC jiri roputa ndi ga eji okoloto ya zoo okwa Senators na mpaghara di ichiche na ala anyi a bu Nigeria na afo 2027.

Na mkpoputa osisa yabu ntule aka ochichi ime ulo APC Senatorial Primaries maka Abia North Senatorial District ka onye noro na isi ya na okwa Returning Officer bu Chinedu Orji mere ka amata na Orji Uzor Kalu nwetara vote di puku iri isii na ise, nari isii, iri ise na otu na ime mgbakota onu ogugu vote di puku iri isii na asaa, nari asato, iri ise na ano.

Na ogbonta vote Abia Central Senatorial District ka Chief Emeka Atuma turu ugo dika onye APC Senatorial candidate site na inweta onu ogugu vote puku iri ato na isii, nari iteolu, iri ato na ise na ime mgbakota onu ogugu di puku iri isii na ano, nari abuo na iri na iteolu dika onye Returning Officer yabu ogbonta vote bu Thomas Nkoro siri kpoputa ya.

Na otu aka ahu ka onye Returning Officer lekotara nke ogbonta vote Abia South Senatorial District bu Prof Emmanuel Agbaeze kpoputara Chief Erondu Uchenna Erondu dika onye turu ugo iji okoloto APC zoo okwa Senator ogbonta vote ahu na afo 2027.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited