Akpolitela Onye Jiburu Okwa Governor Ebonyi State Dina Onye Isi Oche Otu Nnyocha Ndi Ga Azo Okwa Na Otu Ndorondoro NDC Na Ala Anyi

Written by on May 19, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Akpolitela nwa amadi ahu jiburu okwa Governor Ebonyi State bu Sen Sam Egwu na okwa onye isi oche otu nnyocha akporo screening committee maka okwa onye isi ala, nke ndi aka na achi State nakwa ndi omebe iwu ogogo etiti nyere otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday site na ozi ode akwukwo izugbe na okwa National Secretary yabu otu ndorondoro NDC bu Barr Ikenna Enekweizu nyefere ndi nta akuko.

Barr Enekweizu kowara na obu mmadu iri na asaa mejuputara otu Committee a.

Ogara na iru kwuputa onye National Legal Adviser yabu otu ndorondoro bu Barr Reuben Egwuaba dika ode akwukwo otu committee a.

Ndi ozo sona yabu otu NDC Screening Committee maka ndi ga azo okwa ochichi gunyere: Comrade Babatunde Ali na okwa Deputy Chairman, Alhaji Buba Galadimma, Hon Mohamed Sani Takori, mazi Daniel Onifade, Chief Asukewe Ikoawaji, nakwa Prof Udenta Udenta.

Ndi ozo gunyere: Barr Fredrick Owotorufa, Hannatu Tanko, mazi Dogo Shammar, Sir Henry Obaze, mazi Clement Agiagie nakwa Barr Fatima Musa Abba.

Na oge ona akowa na obu na elekere ano nke uhuruchi a ka aga edu ndi a na iyi olu ka Barr Ikenna Enekweizu mere ka amata na Sen Sam Egwu akpolitere na okwa onye isi oche otu committee a ejiela okwa ndi gunyere: Governor Ebonyi State, Minister ala anyi huru maka mmuta na oge ochichi Late President Umaru Musa Yar’Adua nakwa okwa Senator ogbonta vote Ebonyi North Senatorial District na ulo nzuko ukwu Senate ala anyi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited