Aka Na Achi Rivers State Arituola Na Atumatu Ya Iji Okoloto APC Zoghari Okwa Governor Na Afo 2027
Written by admin on May 21, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara arituola na isonyere zoo okwa na ntule aka ochichi ime ulo otu ndorondoro All Progressives Congress APC maka iji okoloto otu ndorondoro ahu zoo okwa Governor na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.
Nke a putara ihe na ozuzu oke ya na abali unya bu Wednesday na Port Harcourt bu obodo State ahu site na onu yabu aka na achi State.
Gov Fubara kowara na mkpebi ya biara kwere maka echiche miri emi onwere banyere nke a.
Yabu aka na achi Rivers State gara na iru mee ka amata na omere mkpoturu gaara ezinulo ya, ndi enyi nakwa ndi nkwado ya tupu onwe mkpebi a.
Na oge ona akowa na mkpebi a fiara ya aru ime ka Gov Fubara kwuputara na oga akwado onye obuna mechara turu ugo iji okoloto otu ndorondoro APC zoo okwa Governor State ahu na afo 2027.
Iga echetazi na obu taata bu Thursday, abali iri abuo na otu nke onwa May afo a bu 2026 ka otu ndorondoro APC ga achikoba ntule aka ochichi ime ulo Party Primaries iroputa ndi ga eji okoloto ya zoo okwa Governor State enwegasiri na ala anyi na afo 2027.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.