Adola Jonathan Aka Na Nti Megide Iputa Metoo Aha Ya Na Ntule Aka Ochichi Afo 2027
Written by admin on May 21, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ayiola onye ahu jiburu okwa onye isi ala anyi bu Former President Goodluck Jonathan ka okwanyere onwe ya ugwu ma zeere ihe obuna ga emeto aha ya na okwe ndorondoro ochichi Nigeria dika osiri metuta ntule aka ochichi izugbe afo 2027.
Ayiyo a putara ihe unya bu Wednesday site na onu onye ahu jiburu okwa Governor Jigawa State bu Sule Lamido na ozi onyefere ndi nta akuko na owa ozi mmekorita ohaneze.
Lamido kowara na atumatu obuna ikpobata Jonathan izo okwa onye isi ala ozo na afo 2027 bu imeto aha na ugwu na nsopuru ana enye ya na ala anyi nakwa mba uwa.
Yabu onye jiburu okwa aka chiri Jigawa State kowara ayiyo ufodu ndi onu na eru na okwu na ayo Goodluck Jonathan ka oputa zogharia okwa onye isi ala dika omume nduhe uzo ma buru nke igbu ezi onodu ya na oha obodo.
Iga echetazi na alaka otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP nke ahu Kabiru Turaki nona isi ya noro nwanne unya bu Tuesday kwuputa yabu Former President Goodluck Jonathan dika onye ga eji okoloto ha zoo okwa onye isi ala Nigeria na ntule aka ochichi afo 2027.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.