Mba America Akpugala Onye Jiburu Okwa Onye Isi Ala Mba Cuba Ulo Ikpe Maka Ebubo Agwa Ekperima
Written by admin on May 21, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba America akpugala onye ahu jiburu okwa onye isi ala mba Cuba bu Former President Raul Castro ulo ikpe kwere maka ebubo atumatu ojo igbu umu afo America nakwa agwa ekperima ozo na afo 1996.
America mere ka amata na nke a ka yabu onye jiburu okwa onye isi ala mere site na inoro na isi ugbo ejiri gbatuo ugboelu abuo na etiti mba Cuba nakwa Florida nke America.
Ihe ndi a putara ihe na ozuzu oke ya unya bu Wednesday site na nnyocha ngalaba ikpe nkwumoto mba America mere ma tuo Former President Castro nakwa mmadu ise ndi ozo aka ojo na ebubo agwa ekperima a.
America boro ebubo sina ndi a gbaturu ugboelu abuo nke otu Cuban-American Group Brothers to the Rescue ma gbuo mmadu ano na ime ha nke gunyere mmadu ato bucha umu afo America.
Former President Raul Castro di afo iri iteolu na ano ka odi ugbu a ka akowara na obu ya ji okwa Minister ndi agha mba Cuba na yabu afo 1996 agbaturu ugboelu abuo ahu.
Ka osiladi, onye no ugbu a na okwa onye isi ala yabu mba Cuba bu President Miguel Diaz-Cancel akatola atumatu a ochichi President Donald Trump jiri akpuga Former President Castro ulo ikpe.
President Diaz-Cancel kowara nke a dika magomago ndorondoro ochichi sitere mba America ma buru nke na enweghi ntoala iwu ogbadoro ukwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.