CP Orutugu Akatola Ndi Ndu Obodo Maka Nkusu Emegara Ndi Uwe Ojii Nakwa Ndi Nchekwa Na Anambra State

Written by on June 2, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Anambra State bu CP Ikioye Orutugu enwela mgbaru iru megide onye Councilor nakwa President General obodo Ndiukwuenu dina Orumba North LGA bukwanu ebe ndi oji egbe eri noro gbuo ndi uwe ojii mmadu abuo nakwa ndi nkiti mmadu abuo na abali nwanne unya bu uka kwere maka irapu ndi ekperima na obodo ahu na agwaghi ndi nchekwa.

Ozi kowara na obu na ogologo okporo uzo Amansea-Ndiora-Ndiukwuenu-Awa-Ufuma road ka ndi oji egbe eri ahu noro tochie ugboala njem olu akporo convoy onye eze ndi olu na okwa Chief of Staff nyere Gov Charles Chukwuma Soludo bu Chief Ben Nwankwo ma suo ndi mmadu akwukwo.

Ka osiladi, na okwu ya oge owuchiri njem nleta na ebe ahu nkusu a mere na uhuruchi unya bu Monday ka CP Orutugu nuru iyi ihuna aka kpatachara ndi niile aka ha dina oba ekere ede nyere odachi a, dika okowara na onyego iwu nnyocha.

Okwuputara na ezigago ndi nchekwa aka kara aka na yabu obodo Ndiukwuenu maka nnyocha a.

Onye nta akuko anyi wetara ozi na ndi sonyere CP Orutugu na njem a gunyere: ndi agha elu ala Nigerian Army, ndi uwe ojii nakwa ndi nche Agunechemba Security Squad.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited