Ndi Uwe Ojii Ala Anyi Enyela Nkowa Na Ozuzu Oke Megide Ebubo Na Ndi Ochu Efi Mere Nkusu Ma Gbuo Ndi Mmadu Na Awgu LGA
Written by admin on June 2, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State akowala ya dika akuko awarawa bu ozi onyonyo na efeghari na owa ozi mmekorita ohaneze sina ndi ochu efi sitere agburu Fulani mere nkusu ma gbuo ufodu ndi mmadu na mpaghara ebe uzo nwere njiko amara dika junction dina Awgu LGA nke State a, kpomkwem na ogologo okporo uzo ahu sitere isi obodo Enugu gawa Port Harcourt.
Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Tuesday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State a bu SP Daniel Ndukwe kowara yabu ozi onyonyo na efeghari dika nke awarawa ma doo aka na nti sina habu ndi nchekwa ga egosi ndi akuko awarawa ihe oku ji nti oke eme.
SP Ndukwe kwuputara na nnyocha mbuzo habu ndi uwe ojii na egosi na ihe ahu na efeghari na owa ozi abughi ihe mere eme.
Na aka nke ozo ka ochichi Enugu State buru uzo noro unya bu Monday site na onu Commissioner State a na ahu maka mgbasa ozi na nrikorita ozi bu Dr Malachy Agbo kowa yabu ozi onyonyo na efeghari dika akuko ugha.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na yabu ozi onyonyo ana ebughari na ufodu usoro owa ozi na ebo ebubo mana akowa na obu na Awgu Junction ka ndi ochu efi sitere agburu Fulani noro na odi nso a wakpo ma suo ufodu ndi mmadu akwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.