Otu Jikoro Ndi Nkuzi Ala Anyi Emela Ngaghari Iwe Megide Ajo Onodu Nchekwa Na Ulo Akwukwo Enwegasiri Na Nigeria

Written by on June 2, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu jikoro ndi nkuzi ala anyi akporo Nigeria Union of Teachers NUT ngalaba ya nke FCT Abuja anorola taata bu Tuesday wuchie na ogbe di ichiche na yabu isi obodo Nigeria ma mee ngaghari iwe na uzo udo megide ajo onodu enweghi nchekwa na ulo akwukwo enwegasiri obodo a.

NUT kowara ya dika ihe na echu ura bu ajo onodu amaghi kwuru ulo akwukwo di na Nigeria nogasi ma buru nke nyere ohere ndi ntori, ndi osochi egbu nakwa ndi ekperima ozo di ichiche jiri ulo akwukwo mere ebe igba aka ahia nke mwakpo ha.

Ngaghari iwe a nke isiokwu ha jiri puta ya gbadoro anya na idiko na otu nke mmuta nakwa odi na iru ka NUT kwuputara na obu nzaghachi nyere nkusu anogasiri na odi nso a mee na ulo akwukwo di ichiche nakwa ntori atoro umuakwukwo na ndi nkuzi ha na Oyo gunyere Borno State na odi nso a.

Na okwu ya ka onye isi oche otu NUT na FCT Abuja bu Abdullahi Shafa mere ka amata na ngaghari iwe a bu dika osiri di na ntuzi aka yabu otu jikoro ndi nkuzi na ogogo etiti kwere maka nkawanye njo ajo onodu nchekwa na ulo akwukwo.

Ozi kowara na ndi oji egbe eri noro na abali iri na ato nakwa iri na ise nke onwa May gara aga wakpo ulo akwukwo dina Oyo gunyere Borno State ma toro opekata mpe umuakwukwo iri asato na abuo na habu State abuo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited