Otutu Ndi Omebe Iwu Ochichi Etiti Nigeria Apuola Na Ozuzu Oke Na Otu Ndorondoro Ha Ma Banye Na Ndi Ozo

Written by on June 2, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Anorola taata bu Tuesday huta mmadu iri na ato ndi omebe iwu ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti ala anyi akporo House of Representatives ka ha mere ya na ozuzu oke ya bu isite na otu ndorondoro ochichi ha nobu na ha banye na nke ozo.

Nke a putara ihe na ogbako plenary yabu ulo nzuko bukwanu ebe onu na ekwuru ha na okwa Speaker bu Rt Hon Tajudeen Abbas noro guputa ederede letter ndi a jiri gbanwe otu ndorondoro ha na ozuzu oke ya.

Na yabu ogbako ka onye ahu turu ugo iji okoloto otu ndorondoro All Progressives Congress APC zoo okwa Governor Rivers State na afo 2027 bu Hon Ogundu Kingsley Chinda noro gbaa alukwaghim na ozuzu oke ya na okwa ojibu dika onye ndu otu ndorondoro pekariri na onu ogugu akporo minority leader nyere ulo nzuko ahu.

Hon Chinda ka emere ka amata na alukwaghim a ogbara na ozuzu oke ya taata wetara ya na isi njedebe bu ochichi ya dika minority leader ulo nzuko ahu bukwanu okwa onona ya oge ositere na otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP turu ugo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited