NDLEA Anwuchikoola Otutu Ndi Mgbere Ogwu Ike Na Edo State
Written by admin on June 3, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ulo olu na ebu agha emegide inu nakwa ire ogwu ike na Nigeria bu national drug law enforcement agency NDLEA ekwuputala na ha noro na onwa May gara aga wee nwuchie mmadu iri ano na asato na atu mgbere ogwu ike na Edo state.
Nke a putara ihe site na ozi ulo olu NDLEA ngalaba ya nke Edo state nyefere ndi nta akuko unya bu abali abuo nke onwa June afo a bu 2026 na Nigeria.
Ha gakwara na iru mee ka amata na ha naputara habu ndi omekome ogwu ike narcotic di ntu kilograms nari ise, iri ano na otu, na uma iri ano na asaa na ime onwa May nke afo a.
Kosiladi, habu ndi otu mgbere ogwu ike ka ha mere ka amata na ha gunyere umu nwoke di iri abuo na ise nakwa umu nwaanyi di iri abuo na abuo bukwanu ndi anwuchiri na mpaghara digasi ichiche nke state ahu.
Na ikpazu ka ha kwunworo mkpebi ha iga na iru ibu agha megide inu nakwa ire ogwu ike bukwanu nke na etikpo agam na iru umu afo ala anyi bu Nigeria.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.