Ochichi Etiti Ekwela Nkwa Iweghachite Udo Na Ezi Nchekwa Nyere Ohaneze Ndi Nigeria.

Written by on June 6, 2026

by Oluchi Okafor-Iloh

Osote onye isi ala anyi bu senator Kashim Shettima akpokuola umu afo Nigeria Ka ha nogide n’ekpere maka udo na nkwudosi Ike ala anyia, ma kwe nkwa si na onye isi ala anyi bu president Bola Ahmed Tinubu di uchu iweghachite udo na nchekwa na mpaghara Nile nke obodo a.

Ogakwara n’iru kwuputa mbo ochichi etiti n’agba maka nchekwa yanakwa ntohapu gara umu akwukwo nakwa ndi nkuzi ndi ahu Ka no n’aka ndi ntori k’odi ugbua.

Senator Shettima kporo okua unya bu Friday na Abuja oge omechara ekpere jummat bu nke emere n’ogige National mosque ma buru ekpere ejiri merube emume ncheta ochichi onye kwuo uche ya .

Na okwu Chukwu ya Ka onye Iman n’elekota National Mosque bu Haroun Eze noro rio ndi nile biara ekpere ahu aririo Ka ha buru ezigbo umu afor obodo a.

Orioziri ndi ndi n’ogogo Nile, Ka ha weputa atumatu aga eji gbo ajo onodu nchekwa ma weta udo toro ato bu nke okowara dika nnukwute ihe kacha nkpa nyere obodo a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited