Akpugala Ndi Ukochukwu Awarawa Mmadu Asato Ulo Nga Dina Anambra State
Written by admin on June 6, 2026
by Oluchi Okafor-Iloh
Ulo ikpe Anambra State High Court ji Awka bu isi obodo state ahu mere onodu anorola unya bu Friday nye iwu ka akpuga ndi ukochukwu adigboroja mmadu asato ulo nga oge akputachara ha n’ulo ikpe kwere maka ida iwu nchekwa obodo state ahu emere n’afor 2025 yanakwa ikpota ndi ha na akwu ugwo ka ha me ihe ngosi oru ebube adigboroja.
Ndi a akpugara ulo nga gunyere: pastor Ndubuisi Nwachukwu nke ulo uka Omega Dominion ministry,Ekeleme Ugochukwu nke Cloud of glory prophetic ministry, Bishop Emeka Nwankpa nke chapel of faith ministry, Peter Chukwu n’elekota ulo uka Messiah Adoration ministry, nakwa chinedu Egwuonwu nke citadel of grace ministry.
Ndi ozo aburu, Ebele Nnachukwu nke Jehovah the mighty than All ministry, Miracle Iruoma nke City of power ministry tinyekwara chukwukadibia ogwuama nke land of testimony Adoration ministry.
Habu ndi ukochukwu adigboroja ka ndi nchekwa Agunechemba nke onye ndu ha bu nwa amadi ahu ji okwa onye ndumodu puru iche nyere aka n’achi Enugu n’ihe banyere nchekwa bu Ken Emeakayi kpuputara n’ulo ikpe.
Ndi a ka ozi na akowa na ha na anarakwa mdi mmadu ego ma ha mesia amansi ndi ahu ha n’eme.
Oge onutachara onu mmiri okwu ndia,ka okaikpe bu Justice Jude Obiora jiri nye ikikere ka etinye ha n’ulo nga ma yigharia ikpe ahu Ka oburu na abali Iri na ise nke onwa June afoa.
N’oge ona agwa ndi nta akuko okwa Ka onye ji okwa Attorney General nakwa commissioner for justice state ahu bu Tochukwu Nweke SAN mere Ka amata na nkwuputa ndia mere so n’ ihe aka ebe .
K’osiladi, nkea sokwa na mbo ochichi state ahu na agba ihuna ekpochauru ndi ukochukwu nakwa dibia Anya nzu adigboroja na state ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.