Ndi Oji Egbe Eri Atorola Nwanne Onye Jitopuru Okwa Minister Ume Oku Nigeria Nakwa Ndi Ozo

Written by on June 3, 2026

by Chika Nwazu

Ndị oji egbe ana amabeghi ndị ha bụ atọrola nwanne nwaanyị nyere onye ahụ jitopuru ọkwa minista hụrụ maka ọkụ latric n’ala anyị bụ Adebayo Adelabu.

Adelabu gbara arukwaghim n’ọchịchị President Bola Ahmed Tinubu iji nye ya ohere ị sonyere na ntụli aka ime ụlọ nke otu ndọrọndọrọ APC maka ọkwa gọvanọ Oyo State bụ nke mechara funari ya ma gara Senator Sharafadeen Alli.

Ozi mere ka amata na nwaanyị ahụ ka a tọrọ yana ụmụ ejima ya abụọ n’isi ụtụtụ taa na Ibadan bụ isi obodo Oyo State.

Nwaanyị ahụ ka e nyere aha ya dịka Odoziaku Olaide Busayo Adegoke John Paul ebe ụmụ ejima ya bụ Peter na Paul.

Aka ndị ntọri kpara ha oge nwaanyị ahụ bu ụmụ ya aga n’ụlọ akwụkwọ ebe ana amatabeghi ebe ha nọ ruo ugbua.

Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii na Oyo Steeti enwebeghi ihe ọbụla ha kwuru banyere ọnọdụ ahụ mana ènyèmaka mgbasa nyere onye ahụ jibu ọkwa minista bụ Femi Awogboro emela ka ọhaneze mata na ọ bụ eziokwu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited