Ezinulo Aguiyi-Ironsi Ezigala Ozi Nkwanyere Ugwu Gaara Ezinulo Onye Jiri Ndu Ya Chuo Aja Nyere Onwu Nna Ha

Written by on June 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ezinulo nwa amadi izizi ahu jiri okwa onye isi ala na oge ochichi ndi agha na ala anyi bu Late Maj Gen Johnson Thomas Umunnakwe Aguiyi-Ironsi eburula ekene ncheta onwu gaara onye izizi nke ahu jiburu okwa Governor na ochichi ndi agha na mpaghara Western region ala anyi bu Late Lt Col Francis Adekunle Fajuyi.

Ezinulo Aguiyi-Ironsi kowara onwu Late Lt Col Fajuyi dika nchu aja ejecha ogwu ma buru nke dike na agha.

Na ozi ya unya bu Friday ka nwa nwoke Aguiyi-Ironsi ma buru onye jiburu okwa minister ala anyi huru maka ndi agha na oge ochichi Former President Olusegun Obasanjo bu Chief Thomas Aguiyi-Ironsi chetara Fajuyi na ebe odi ukwuu maka nchu aja ya ma kowa na ezinulo Aguiyi-Ironsi nakwa nke Fajuyi enwela njiko na enweghi ihe ga ekewanwu ha.

Chief Thomas Aguiyi-Ironsi kowara na abali iri abuo na iteolu nke onwa July afo a bu 2026 ga eme ya afo iri isii zuru oke Fajuyi nyefere ndu ya izoputa Aguiyi-Ironsi.

Iga echetazi na Late Lt Col Francis Adekunle Fajuyi jiri ndu ya chuo aja na mbo ya inaputa Late Maj Gen JTU Aguiyi-Ironsi na afo 1966 oge ndi agha nwudoro ya na ndu na Ibadan bu isi obodo Oyo State ka odi ugbu a ma mechakwa gbuo yabu onye isi ala oge ahu bu nwa afo Igbo sitere ebe amara ka odi ugbu a dika Abia State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited