Fr. Mbaka Enyela Nkowa Ihe Kpatara Odida Jonathan Na Ntule Aka Ochichi Afo 2015
Written by admin on June 11, 2026
by Chika Nwazu
Onye ụkọchukwu nzuko nso Catholic ma bụrụ onye nlekọta ogige ekpere Adoration Ministry, Enugu, Nigeria, bụ Rev Fr Ejike Mbaka, ekwuola na onye bụbu Onye Isi Ala Nigeria, bụ Goodluck Jonathan, ka e meriri n’ntuli aka afọ 2015 n’ihi na ọ jụrụ ịgbaso ndụmọdụ e nyere ya.
Rev Fr Mbaka kwuru na ya nyere Jonathan ndụmọdụ ka o wepụ onye bụbu Onyeisi oche ụlọrụ n’ahụ maka ntụli aka ọchịchị bụ Independent National Electoral Commission INEC, bụ Prof Attahiru Jega, n’ọrụ, mana na Jonathan ejighị ndụmọdụ ahụ were kpọrọ mkpa.
N’okwu ya n’otu ihe onyonyo vidio na-agbasa ugbu a, ka Fada Mbaka kwuru na ọ na-akọwa okwu mbụ o kwuru banyere nsogbu nchekwa na-adakwasị ala anyị ugbua, nke o kwuru na ọ nwere mgbọrọgwụ n’ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi na Rev Fr Mbaka kwuru na ụfọdụ ndị okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị afọ tara mmiri bụ ndị na-akpalite nsogbu nchekwa ahụ iji wepụ Onye Isi Ala ugbu a, bụ Bola Tinubu, dịka e mere Jonathan.
Nkea emela ka ọtụtụ ndị malite ikwu n’aka Fr Mbaka dị na mmeri emeriri Jonathan n’ntuli aka afọ 2015.
Mana n’okwu ọhụrụ, Mbaka kwuru na egosi na ọdịda Jonathan sitere n’ihe o kpọrọ echeghi echiche nke ọma yana nnupụisi nyere ndụmọdụ nke “onye nke Chineke”.
N’okwu ya ka o mere ka amata na ihe ndị mmadụ na-ekwu n’ịntanetị ekwesịghị ịdọrọ uche mmadụ, dịka ọ kọwara Goodluck Jonathan dịka ezigbo enyi ya.
O kwusiri ike na emerighi Jonathan n’ihi okwu ọnụ ya, kama na nwa amadi ahụ họọrọ ụzọ nke ka ya mma.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.