Otu Jikoro Ndi Guru Akwukwo Na Ulo Akwukwo Nwafor Orizu College Of Education Ekwela Nkwa Nkwado Nyere Ulo Akwukwo Ahu
Written by admin on June 12, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi na okwa Provost ulo akwukwo Nwafor Orizu College of Education dina Nsugbe na Anambra State bu Prof. Victor Ifeanyi Obiora Ndirika anabatala otu jikoro ndi guchagoro akwukwo na ulo akwukwo ahu nke onye isi ha na okwa National President bu Prince Emeka Oramadike na nzuko puru iche ha nwere.
Na okwu ya na nzuko a, ka Prof Ndirika mere ka amata na ebum na uche ya bu ikwalite njiko aka na olu nyere habu ndi guchagoro akwukwo maka mmepe na ibugo ulo akwukwo ahu na ogogo ka mma.
Yabu onye Provost kowara otu a akporo Alumni Association dika mgborogwu nkwado nyere ulo akwukwo niile.
Na nke ya, ka yabu onye National President otu a akporo Nwafor Orizu College of Education Alumni Association bu Prince Emeka Oramadike buru ukpo ekene gaara Prof Ndirika maka mkpolite na okwa ya dika onye isi ulo akwukwo ahu ma kwe nkwa njikere ndi otu ya iruko olu nyere ya.
Na oge ona akowa ulo akwukwo ahu dika ide ji ulo nyere ime nke oma ha na mmuta ka Prince Oramadike kenere Gov Charles Chukwuma Soludo maka olu oma ya nyere yabu ulo akwukwo.
Na nke ya ka onye ndumodu iwu akporo Legal Adviser nyere otu a bu Barr. Nnadiume Oforkansi kwere nkwa mkpebi ha idonyere ochichi yabu Nwafor Orizu College of Education ukwu, ma kowa na otu a gbadoro ukwu na ezi nkwuba aka oto, udo, idiko na otu gunyere usoro iwu.
Anokwara na nzuko a nyefe akwukwo iwu otu a nakwa nke Alumni Muffler gaara yabu onye Provost, ebe onye jigodu okwa Bursar ulo akwukwo ahu bu mazi Tony Aniebo noro na ozi itu mma mma ya kwuputa ekene gaara ndi ndu yabu otu Alumni Association.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na ndi ndu ozo nke otu ahu sonyere na njem nzuko a gunyere: Hon Emmanuel Onoh, Ubaka Onwuanibe, Dr Cyriacus Mbanugo, Ibeto Michael Uchenna, Iliemenam Jude Chukwunonso, Ibekwe Obinna nakwa Akamigbo Izuchukwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.