Ochichi Etiti Nigeria Ekwela Nkwa Inaputacha Umu Afo Ala Na Mba South Africa

Written by on June 18, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt etiti ala anyi emela ka amata na umu afo Nigeria kariri otu puku bina mba South Africa edenyego aha ha ka akpoghachite ha ala anyi a, dika yabu ochichi etiti kwere nkwa sina onweghi nwa afo obodo a gosiri mmasi isite South Africa naghachite aga agbaghapu na mba ahu.

Na okwu ya ka Minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu mere ka amata na anorogo kemgbe abali iri na otu nke onwa a bu June kpoghachite umu afo ala anyi di nari abuo, iri ise na asato site yabu South Africa na agba nke mbu ya, ebe obu Minister ogo nta na ahu maka odimma mba ofesi bu Amb. Sola Enikanolaiye nabatara ha na aha ochichi etiti na odu ugboelu Murtala Muhammed International Airport dina Lagos State.

Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Thursday bu onye enyemaka puru iche nyere yabu Minister na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr. Magnus Eze ka Amb. Odumegwu-Ojukwu kowara na aga agbasoro usoro Renewed Hope Agenda ochichi President Bola Ahmed Tinubu ji aga huna onweghi nwa afo obodo a agbaghpuru ita ahuhu na mba ndi ozo.

Omere ka amata na President Tinubu ekwugo na ala anyi ga agbasoro usoro iwu nke ulo nzuko omebe iwu na ihe obuna oga eme banyere nzaghachi mmekwanata megide nkusu ana akusu umu afo ala anyi na mba South Africa.

Iga echetazi na anola kemgbe ahuta ajo onodu nkusu megide ndi obia na udi akporo xenophobic attacks na mba South Africa nke umu afo ala anyi nona mba ahu so eketa oke ojo ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited