INEC Akpoputala Oyebanji Dika Onye Turu Ugo Na Ntule Aka Ochichi Okwa Aka Na Achi Ekiti State
Written by admin on June 21, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC akpoputala aha aka na achi Ekiti State ma buru onye ji okoloto otu ndorondoro All Progressives Congress APC zogharia okwa aka na achi State ahu na ntule aka ochichi Governorship election were onodu unya bu Saturday bu Gov Biodun Oyebanji dika onye turu ugo iga ochichi nke ugboro abuo ya.
Na mkpoputa osisa ntule aka ochichi a na isi ututu taata bu uka ka onye Returning Officer huru maka ya bu Prof Adenike Oladiji mere ka amata na Gov Oyebanji ji akara vote di nari puku ato, iri na iteolu, nari abuo, iri abuo na ano turu ugo ma merie Oluwole Oluyede nke otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP kachasi maa ya aka na iru bukwanu onye nwetara puku iri ano, nari ise, iri ano na ato.
Prof Oladiji mere ka amata na Dare Bejide nke otu ndorondoro African Democratic Congress ADC gbara onye nke ato site na inweta akara vote di puku iri na abuo, nari asato, iri asaa na abuo.
Okwuputara na obu mmadu di nari puku ato, iri asato na ano, nari iteolu na iri ano ka enyochara isonyere na yabu ntule aka ochichi, mana obu nari puku ato, iri asaa na ise, nari asaa, iri asaa na asaa mechara tuo akwukwo nwere isi.
Nke a ka yabu onye Returning Officer ma buru Vice-Chancellor mahadum Federal University of Technology kowara na obu kwere maka na akwukwo vote di puku isii, nari ato, iri ato na abuo ka ajuru aju.