Otu Ndorondoro Ochichi PDP Akatola Okwu Gov Nwifuru Kwuru Na Odi Nso A Kwugide Nyesom Wike
Written by admin on June 29, 2026
by Maduabuchi Onwe

Nyesom-Wike-and-Nwifuru
Otu ndorondoro ochichi People’s Democratic Party PDP akatola nwamadi ahu na achi Ebonyi State bu governor Francis Ogbonna Nwifuru maka ihe ha kowara dika okwu ojoo okwuru gara minister na ahu maka Abuja bu Nyesom Wike na odi nso a.
Ha gakwara na iru katoo adighi ike nakwa enweghi afo ojuju ha gara ochichi governor Nwifuru na Ebonyi state, bukwanu onye ha kowara na onwebeghi ihe doro anya oruputagoro na state ahu kamgbe afo 2023 obanyere na ochichi.
Nke a putara ihe site na onu onye ode akwukwo mgbasa ozi na izugbe nyere yabu otu ndoro ndoroochichi PDP na Nigeria bu maazi Haruna Jungudo oge yana ndi nta akuko na akari na Abuja bu isi obodo Nigeria na ubochi Saturday.
Na ikpeazu ka ha kpokuziri ndi oru nchekwa nille enwere na ala anyi, nakwa otu kwuru na onwe ha na abughi nke government ka ha na enyocha okwu nwamadi ahu, dika ha mere ka amata na okwu di etu ahu nwere ike ibuta nnukwute ogbaghara na okwe ndorondoro ochichi Nigeria.
Iga echetazi na governor Francis Ogbonna Nwifuru noro na odi nso a wee kwuputa na ochichi ya ga ememina onye obuna choro itinyere ya aja na garri na state ahu, dika oboro ebubo na Nyesom Wike sona ndi na ebute nsogbu na okwe ndorondoro ochichi state ahu.