Agba Nke Ato Umu Afo Ala Anyi Ana Akusu Na Mba South Africa Anaghachitela Nigeria
Written by admin on June 30, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Agba nke ato ha na ime umu afo Nigeria ahu ana akusu na mba South Africa anorola taata bu Tuesday wuchie ala anyi a, kpomkwem na odu ugboelu Murtala Muhammed International Airport dina Lagos State.
Nke a bu dika ugboelu Air Peace bu ha wuchiri odu ugboelu ahu dina Ikeja bu isi obodo Lagos State na agbata oge oforo nkeji isii ka okuo elekere iri na otu nke ututu taata.
Na okwu ya ka onu na ekwuru ulo olu Ministry ogogo etiti ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi bu Kimiebi Imomotimi Ebienfa gwara ndi nta akuko na habu ndi ebunatara taata di nari abuo, iri isii na iteolu.
Ebienfa kowara na obu onye Director, ngalaba African Affairs nke yabu ulo olu Ministry bu Amb. Haruna Ali-Gombe duru ndi ozo welitere isi wuchie odu ugboelu ahu inabata umu afo ala anyi a.
Ogara na iru gwa ndi nta akuko na nke a bu iji gbakwunyere na mmadụ iri isii na isii anoro na abali iri abuo na ano nke onwa a bu June site yabu South Africa kponata na agba nke abuo usoro nnaputa a.
Ndi nta akuko nwetara ozi na adila na mbu na abali iri na otu nke onwa a na agba nke izizi olu nnaputa a kponata umu afo ala anyi di nari mmadụ abuo, iri ise na asato site yabu mba South Africa, nke mere na ndi nke a akponatara taata emego ha mgbakota onu ogugu nari mmadụ ise, iri iteolu na ato.
