Gov Mbah Enyela Ohere Agum Akwukwo Mahadum Na Efu Gaara Nari Kwuru Nari Umu Afo Enugu State

Written by on June 30, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

 

mbah

mbah

Aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah enyela nkwado ohere agum akwukwo na efu gaara ndi kariri nari mmadu asaa na iri isii na usoro 2025/2026 Local Scholarship Scheme iji kwalite atumatu ochichi ya ji na aka nyere ezi onodu mmuta State a.

Na okwu ya unya bu Monday na isi obodo Enugu ka onye Executive Secretary ulo olu ohere agum akwukwo na efu nakwa ego mgbazinyere mmuta akporo Enugu State Scholarship and Education Loans Board bu Chukwuemeka Mbah mere ka amata na ndi a nwetara ohere oma a sitere okpuru ochichi ime obodo iri na asaa ahu enwere na State a.

Mbah gwara ndi nta akuko na mmadu kariri nari isii na ime ha bu umuakwukwo mahadum na udi undergraduate students, ebe ndi ozo di otu nari bu ndi guchagoro akwukwo mahadum nke izizi ha mana acho nzere mmuta ogo elu ozo na udi postgraduate students.

Okwuputara na ndi nke di otu nari na iri isii bu ndi nkuzi ngalaba ohaneze na udi okporo public sector teachers.

Na oge ona akowa na obu nnwale usoro igwe ome ka mmadu amara dika Computer Based Test CBT ka esiri roputa ndi a ka yabu onye Executive Secretary gwara ndi nta akuko na ezigagoro ha ozi banyere yabu ohere agum akwukwo na efu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited