Ochichi Etiti Nigeria Anaputala Umu Afo Ala Anyi Ejichiri Na Ulo Nga Mba Cote D’Ivoire
Written by admin on July 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt etiti ala anyi anaputala umu afo obodo a mmadu ise ejichiri kemgbe onwa August afo 2025 na ulo nga dina Abidjan bu isi obodo mba Cote D’Ivoire, ebe onye kara ime ha onye nke isii nwuru ngwangwa agbaputachara ha na ebe ahu ejichiri ha.
Na ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Wednesday ka onye enyemaka puru iche nyere minister ala anyi na ahu maka odimma mba ofesi na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru bu Dr. Magnus Eze mere ka amata na obu yabu minister bu Amb. Bianca Odumegwu-Ojukwu nakwa onye Director General ulo olu National Orientation Agency bu Mallam Lanre Issa-Onilu gunyere ndi ozo noro na odu ugboelu Nnamdi Azikiwe International Airport dina Abuja na uhuruchi unya bu Tuesday nabata ndi a anaputara oge esitere Abidjan kponata ha.
Na okwu ya ka Amb. Odumegwu-Ojukwu mere ka amata na agwaghi ochichi ala anyi maka njichi a, kpatara ojiri gbuo oge igbagara ha oso enyemaka, gunyere ihe mkpobi ukwu amaghi asusu French ana asu na mba ahu bu habu umu afo ala anyi ejichiri.
Na oge ona akowa na obu usoro oma President Bola Ahmed Tinubu ji na aka maka odimma umu afo ala anyi ka eji gbagara ndi a oso enyemaka nnaputa ka Amb. Odumegwu-Ojukwu doro aka na nti megide njem mba ofesi na edoghi anya, ebe oyoro ochichi Sokoto State bu ebe ndi a sitere ka okeputara mmadu ise a anaputara ohere ntiteghari nakwa aka olu.
Otu na ime ndi a anaputara bu Aliyu Malami mere ka amata na obu maka azum ahia ka ha kworo site Sokoto State gawa mba Cote D’Ivoire ma nwetazie onwe ha na ulo nga kwere maka amaghi jiri asusu French mba ahu na asu nyenwuo nkowa banyere onodu ha, dika otoro govt etiti ala anyi maka iga naputa ha.
Dr. Magnus Eze kowaziri na Amb. Odumegwu-Ojukwu nyefere ndi a akuru ngwa onyinye sitere ulo olu Ministry ya, ulo olu National Orientation Agency nakwa ulo olu ndi ozo, ebe aturu anya na obu taata ka hana ndi ezinulo ha na Sokoto State ga ejiko onwe ha ozo.
