Atiku Abubakar Eturula Ugo Na Ozuzu Oke Iji Okoloto ADC Zoo Okwa Onye Isi Ala Nigeria Na Afo 2027

Written by on May 28, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Akpoputala aha nwa amadi ahu jiburu okwa osote onye isi ala anyi bu Alhaji Atiku Abubakar dika onye turu ugo na ozuzu oke ya iji okoloto otu ndorondoro African Democratic Congress ADC zoo okwa onye isi ala Nigeria na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.

Nke a bu dika osiri di na mmeri yabu nwa amadi nwetara na ntule aka ochichi ime ulo ADC Presidential primary election were onodu na odi nso a na onumara Ward niile dina ala anyi.

Alhaji Atiku Abubakar turu ugo a ma merie mmadu abuo ndi ozo hana ya zoro okwa a bu ndi gunyere: onye ahu jiburu okwa minister ala anyi huru maka njem ma jibukwa okwa Governor Rivers State bu Rotimi Chibuike Amaechi nakwa onye oji ego achu nta ego ama ama bu Mohammed Hayatu-Deen.

Na ozi otu ndorondoro ADC weputara na abali putara taata bu Thursday na owa ozi otu ndorondoro a ka omere ka amata na Atiku Abubakar nwetara akara vote di otu nde, nari puku asato, iri ise na ise, nari asaa, iri asato na asaa yabu 1 Million, 8 Hundred and 55 Thousand, 7 Hundred 87 votes.

ADC sitere na ozi a kowa na Rotimi Chibuike Amaechi nwetara nari puku ise na iteolu, nari ato, iri iteolu na asaa nke putara 5 Hundred and 9 Thousand, 3 Hundred and 97 votes, ebe Mohammed Hayatu-Deen nwetara otu nari puku iri asato, nari iteolu na ato yabu 1 Thousand and 80 Thousand, 9 Hundred and 3 votes.

ADC kowara na mgbakota onu ogugu ndi otu ya sonyere na ntule aka ochichi ime ulo a di nde ato, otu nari puku iri na ato, nari ise, iri iteolu na iteolu.

Otu ndorondoro a kpoputaziri aha Atiku Abubakar dika onye Presidential Candidate ya na afo 2027 site na igba onye nke mbu na ntule aka ochichi ime ulo a, ebe Chibuike Amaechi gbara onye nke abuo dika Hayatu-Deen gbara onye nke ato.

Na okwu ya oge onwetachara nturu a na Abuja na abali gara aga ka Atiku Abubakar kwere nkwa inaputa ala anyi bu Nigeria na ihe okowara dika ajo ochichi, ma yoo ndi iwe dina obi na otu ndorondoro a kwere maka mmeri omeriri ha ka ha dajuo ma tikota aka onu nyere ya maka ntule aka ochichi izugbe afo ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited