Prof Ene-Nwannaji Eturala Ugo Iji Okoloto NDC Zoo Okwa Aka Na Achi Enugu State Na Afo 2027

Written by on May 29, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye oka-mmuta ama ama bu Prof. James Ene-Nwannaji eturula ugo dika onye ga eji okoloto otu ndorondoro ochichi Nigeria Democratic Congress NDC zoo okwa Governor Enugu State na ntuli aka ochichi izugbe afo 2027.

Nke a putara ihe na ubochi Friday na ntuli aka ochichi ime ulo Party Primaries otu ndorondoro a were onodu na mpaghara di ichiche na State a.

Prof. Ene-Nwannaji turu ugo a dika onye NDC Governorship Candidate site na imeri ndi ozo hana ya zoro okwa a bu ndi gunyere: Chief Chinyeaka Ohaa nakwa Sen. Gilbert Nnaji.

Na oge ona enyefe ndi nta akuko osisa ntuli aka ochichi ime ulo a ka ode akwukwo yabu otu ndorondoro NDC na State a bu Dr. Sebastine Okafor mere ka amata na nke a were onodu na okpuru ochichi iri na asaa ahu enwere na State a dika osiri di na ntuzi aka isi ulo olu otu ndorondoro a na ogogo etiti ma burukwa ntuli aka ochichi ime ulo ndi olu sitere ulo olu Independent National Electoral Commission INEC gara leta.

Dr. Okafor kowara na Dr. Chika Obetta turu ugo dika onye Senatorial Candidate otu ndorondoro a maka ogbonta vote Enugu North, ebe Dr. Cecilia Ikechukwu nwetara mmeri maka Enugu East dika aroputara Barr. Ugochi Ohajekwe maka Enugu West Senatorial District.

Maka ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti bu House of Representatives ka Dr. Okafor koro ndi nta na Dr. Stephen Ugwoke nwetara mmeri maka Nsukka/Igboeze South Federal Constituency, Barr. Chimezie Nwodo eturu ugo maka Nkanu East/Nkanu West, ebe Barr. Kene Nnadi turu ugo maka Enugu North/Enugu South, dika Comr. Felix Ijegalu nwetara ogbonta vote Udi/Ezeagu nakwazi Barr. Onyebuchi Nwabueze nwetara mmeri maka Igbo-Etiti/Uzo-Uwani Federal Constituency.

Na okwu ya banyere ntuli aka ochichi ime ulo a ka onye isi oche yabu otu ndorondoro NDC na Enugu State bu Dr. Johnpaul Anih kowara ya dika nke ahaziri ofuma, ma buru nke gbasoro ezi ukporo niile na achikwa NDC dika osiri di na iwu ntuli aka ochichi ala anyi nke 2026 Electoral Act.

Dr. Anih kowaziri ndi a turu ugo dika ndi nwere ezi akparama agwa ma buru ndi nwere amamihe, gunyere ndi obara na anu oku maka ezi ochichi.

Yabu onye isi oche otu ndorondoro NDC na Enugu State yoziri ndi nke ahu na enwetaghi mmeri ka ha jiri otu obi sonyere ndi a turu ugo maka ntuli aka ochichi izugbe afo 2027.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited