Author: Onyinye
Page: 3
Ndị uweojii ala anyị sitere Police Headquarters dị na Abuja nọrọ ụnya bu Sunday mee ka amata na ndị uweojii nke ngalaba Force Intelligence Department- Intelligence Response Team FID-IRT, kpara ike dị egwu site n’iwepu otu ndị osochi egbu atọ ji egbe n’oge ọtụtụ ndị uweojii ahụ zutere ha n’ime izu ụka gara. Nkea putara […]
Osote onye isi ala anyi bu Vice President Kashim Shettima, anọrọla ụnya bu Sunday zọpụ njim site na Abuja gawa Addis Ababa bu isi obodo mba Ethiopia, iji nọchite anya ala anyi bu Nigeria na ọgbakọ agba nke abụọ nke United Nations Food Systems Summit bu nke ga amalite na abalị iri abuo na asaa […]
Onye ndu otu ekperime ama ama na mba Ecuador dị na South America enyere aha ya dika Adolfo Macias Villamar, a bụrụla onye anwụchiri ma nyefe ya na aka mba United States iji nye ya ntaramahụhụ ruru ya kwere maka ịgba mgbere ọgwụ ike nakwa ngwa agha. Nwa amadi a amakariri dịka Fito bu onye […]
Government mba South Africa mere ka amata na ọdachi ụlọ elu ise ahụ dara ma gbuo mmadụ iri atọ na anọ bu ndi nọ ọrụ ebe ahụ bu nke ekwesiri igbochi. N’ozi ọhụrụ putara ihe gbasara ọdachi ahụ bu nke site n’aka Minister n’ahụ maka ọrụ na mba ahụ bu Dean MacPherson kwuru na ụlọ […]
Ndị ezinụlọ nwa amadi ahụ jitọpụrụ ọkwa onye isi ala anyi bu Late Former President Muhammadu Buhari kenere onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu, osote ya bu Vice President Kashim Shettima nakwa ọtụtụ ndị ọzọ welitere isi na ala anyi a, tinyekwara ndị sitere mba ụwa dị iche iche maka nkwado ha […]
Ndị ụlọ ọrụ West African Examination Council WAEC, Nigeria, akachapula ya kpamkpam bu ozi ahụ n’efeghari n’uwa ozi bu nke boro ebubo na ha kagburu ule West African Senior School Certificate Examination nke afọ a bu 2025, ha kọwara ozi ahụ dika ozi na edughie ụzọ ma buru ọrụ aka ndị ọjọ. Ozi ahụ malitere […]
Ndị uweojii na Delta State emela ka amata na ha nwuchiri otu nwoke gbara afọ iri abụọ na asaa enyere aha ya dika Kelvin Obakpororo, kwere maka ebubo na ogburu enyị ya nwayi ma burukwa onye mụrụ ya ụmụaka abụọ enyedebere aha ya dika Excellence. Nkea putara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye mmekọrịta […]
Ulo akwukwo mahadum Abia state University ABSU dina ututu emela ka amata na onweghikwa onye nkuzi mahadum ahu nke ha ji ugwo ,ma n’ akowa na ndi nke n’ ekwu na eji ha ugwo onwa iri na abuo bu ndi achuru kemgbe ihe ruru otu afo k’ odi ugbua kwere maka na ha enwetabeghi olu […]
Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC agbatikwuola oge nyere ndebanye aha ndi ga atu akwukwo vote bu nke n’ aga n’ iru ugbua. Nkpebi a putara ihe n’ oge ha nwechara nzuko izu uka ha tata bu Thursday. Na yabu nzuko ka ha noro lebara anya na nkwadobe n’ aga n’ iru maka ntuliaka […]
Otutu ndi n’ azu ahia “ji”na nkwo Ogbede dina Igbo-etiti East LGA nke Enugu State anorola unya bu Wednesday me ngaghari udo ga n’ obi govt state a nakwa n’ ulo nzuko omebe iwu di n’ isi Obodo Enugu. Habu ndi ngaghari udo mejuputara na umu nwanyi ajadu n’ ario ka enye ha ikpe nkwum […]