Author: Onyinye
Page: 2
Amalitego ogbako ozuzu ga ewe abali abuo bu nke eji akuziri ndi mmadu akolu di iche iche nke ga enyere ha aka ikwuru n’ onwe ha ma ikwalitekwa onodu akuluba na Umuahia bu isi Obodo Abia state. N’ oge mgbapee yabu ozuzu ka onye odee akwukwo nyeere yabu Steeti, bu Prof Kenneth Kalu kwuputela na […]
Aka na achi Enugu State bu Governor Peter Ndubuisi Mbah esonyela ndi Steeti ya to onye ahu jitopuru okwa governor Enugu State bu Hon Ifeanyi Ugwuanyi dika omerube mmeme ncheta omumu na o agbara afo iri isii na otu. Na ozi oweputara n’ owa ozi social media ya, ka Gov Peter Mbah noro to yabu […]
Ụlọikpe ekpecha ọgwụ n’ala anyị bụ Supreme Court of Nigeria akachapuola nkabi ikpe nke ụlọ ikpe court of Appeal jiri chụọ Sen Samuel Anyanwụ dịka onye odeakwụkwọ izugbe nyere otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP. Ndị nta akụkọ nwetara ozi na ikpe ahụ nke ndị ọka ikpe mmadụ ise nọrọ n’isi ya taa bụ Fraịdee kabiri ikpe […]
Ọtụtụ ndị ihe banyere otu egwuregwu Galatasaray na-amasị esila na mba Turkey fepu gawa na mba Rwanda ije kwado Victor Osimhen. Osimhen ka a na atụ anya ị sonyere ogbo ya ndị ọzọ n’otu super eagles gaa zute otu egwuregwu Amavubi nke mba Rwanda taa bụ Fraịdee na asọmpi eji etozu oke ndị ga-eso zọo […]
Nwa amadi ahụ ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ Labour Party were zọo ọkwa onyeisi ala n’afọ 2023 bụ Mazi Peter Obi akwala arịrị ma gbaruo ihu ihe kpatara ndị omebe ụlọ nzukọ ogo etiti jiri nyere nkwado ha na ọnọdụ gbata gbata nke onyeisi ala kwupụtara nyere ọchịchị Rivers State. Obi kwuru na ntụliaka ahụ nke […]
Onye ndu nke otu Indigenous people of Biafra bụ Mazi Nnamdi Kanu arịọla mgbaghara nyere Ụlọikpe federal High Court, Justice Binta Nyako yana ọka iwu Adegboyega Awomolo banyere etu o siri kwuo okwu ma ọ bụ kpaa agwa na mgbe ikpeazụ ọ nọrọ wuchaa n’ụlọ ikpe maka ebubo ịgba gọọmenti mgba okpuru ahụ ana ebo. […]
President Bola Ahmed Tinubu na-achị ala anyị anọrọla taa bụ Wednesday duo n’iyi nke Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas dịka onye Sole administrator ọhụrụ nyere ọchịchị Rivers State. Mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ were ọnọdụ n’ogige state house dina Abuja taa bụ Wednesday bụ oge ahutara ọtụtụ ndị nwere agba n’ala anyị nke gụnyere onye […]
Ndị agha ala anyi anorola taa bu Wednesday gaa weghara obi govt Rivers State dina Port Harcourt bu isi obodo State ahu. Nke a na abia dika ogasiri elekere ole na ole onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu nochara na abali unya bu Tuesday kwuputa ajo onodu gbatagbata megide ochichi State ahu […]
Aka chiburu Rivers State ma bụrụkwa onye ruburu ọrụ dịka minista hụrụ maka njem okporo ụzọ n’ala anyị akatola mwepụ onyeisi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu kwụsịrị Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State nọkwa ọrụ ya dịka gọvanọ yana osote ya bụ Ngọzi Ọdụ tinyere ndị omebe iwu nke state ahụ. Ya bụ […]
Commissioner ndị uwe ojii na Anambra Steeti bụ CP Ikioye Orutugu anọrọ taa bụ Wednesday nwee ọgbakọ hana ndị ọkwọ ụgbọala opi ike bụ truck kworo maka ihe mberede okporo ụzọ a malitere inwe aghara aghara na state ahụ. Onye Commissioner ahụ nọrọ n’oge ọgbakọ ahụ gwa ndị ọkwọ ụgbọala ahụ na malite ugbua gawazie […]