IHE MGBAWA ATALA ISI DI NA NWUNYE NA EBONYI STATE

Written by on September 13, 2024

Odachi ihe mgbawa nke ahu nwa bekee kporo Explosion emela na Abakaliki bu isi obodo Ebonyi State ma napu otu nwoke nakwa nwunye ya ndu ha n’ ike.

Yabu ihe mgbawa mere na mpaghara Water Works Road nke isi obodo State ahu ka ozi kowara n’ obu nwoke enyere aha ya dika Mazi George nakwa nwunye ya bu Chioma Buchi ka onapuru ndu ha n’ ike n’ ulo obibi ha ka ruputara ohuru.

Chioma Buchi yana di ya zutere onwu mberede a ka ozi kowara n’ obu nwanne nwaanyi nke obere nyere nwa afo yabu Ebonyi State na’eme nke oma na ngalaba egwu awantiro bu mazi Patrick Nnaemeka Okorie amakariri dika Patoranking.

Ufodu ndi mmadu n’ akowa n’ obu igwe oku Solar Light Battery Inverter gbawara n’ ike napu di na nwunye a ndu ha n’ ike, ebe ndi ozo gwara ndi nta akuko n’ obu ololo ikuku mmuo Gas Cylinder gbawara ma taa isi mmadu abuo a.

Nke a kpatara ndi nta akuko noro unya bu Thursday kpoturu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Ebonyi State bu DSP Joshua Ukandu bukwanu onye kowara n’ odachi a bu eziokwu.

DSP Ukandu gwara ndi nta akuko na habu di na nwunye nwetara nnukwute ihe mmeru aru site na yabu ihe mgbawa, ebe ebugara ha ulo ogwu maka ogwugwo.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Ebonyi State kwuputara n’ obu nwunye nwoke ahu ma buru nwanne nwaanyi Patoranking buru uzo nwuo n’ ulo ogwu, ebe di ya noziri nwanne unya bu Wednesday kubie site na nnukwute ihe mmeru aru ahu.

Ogwara ndi nta akuko na ndi uwe oji kana esi imi nnyocha n’ ala imata nke oma ihe kpatara yabu ihe mgbawa.

Onye nta akuko anyi nwetara ozi na di na nwunye a nwuru n’ ike mutagoro naani otu nwa nwoke gbara afo ato, ebe ihe kpatara n’ obere nwa ahu esonyeghi na ndi yabu odachi gburu n’ ike buna ono na bee nne ya ochie nwa bekee kporo Grandmother oge ihe mgbawa a mere.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies