Mba Israel eburula agha mwakpo ohuru banye na Gaza’s strip.
Written by Onyinye on March 12, 2025
Mba Israel amalitela agha mwakpo ozo gara mpaghara Gaza’s strip ma gbuo opekata mpe mmadu asato gunyekwara otu obere nwa.
Ha nokwara n’ otu aka ahu ikpoghachite mmadu ise bu umu afo mba Lebanon ha jichiri ejichi ma me ka amata na ha ga enwe mkparita ububo banyere atumatu ha ga eji kewa okere ala jikoro hana mba Lebanon
Ha mekwara ka amata na ndi agha mba Israel ga ewe ghara isi Obodo Syria ruo oge ogologo oge.
Ndi olu aru Ike mba Gaza achoputago na opekata mpe ya buru mmadu di puku iri ano na asato,nari ise na ato bu umu afo mba Palestine egbugoro egbu ebe ndi nke di nari puku na iri na otu , nari itolu na iri abuo na asaa bu ndi nke nwetara ihe mmeru aru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.