Akpụpula otu nwaanyị n’ụlọ ikpe magistrate court dina Enugu state.
Written by Onyinye on March 13, 2025
Akpụpula Mrs loveth Helen Alo gbara afọ iri atọ na abụọ n’ihu ụlọ ikpe magistrate court dina council ime obodo Enugu North nke Enugu state maka ebubo na nwaanyị ahụ kwuru na ya goro ụlọ obibi akpọrọ duplex ọhụrụ nke nwere ọnụ ụlọ ise n’ogige WTC Estate dina Enugu state.
Ọnụ na e kwuru ndị uwe ojii na Enugu state bụ SP Daniel Ndukwe bụ ya kwupụtara maka mwuchi nwaanyị ahụ bụ onye o kwuru na ọ bụ n’abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị ka anwụchiri ya site n’aka ndị uwe ojii kworo maka akwụkwọ edere degide nwaanyị ahụ na ọ tụrụ asị sị na ya goro ụlọ ọhụrụ n’ogige estate ahụ.
Mrs Loveth Helen Alo ka e kwuru na ọ nọrọ n’oge ọ na-enye akụkọ otito n’ụlọ ụka Zion prayer ministry outreach nke dina Lagos State were kelee Chineke n’ihu ọhaneze maka ị gọzi ya site na onyinye nke ụlọ ọhụrụ.
Ka osiladi, nwaanyị ahụ mechara kweta n’ezie na ya kpara ya bụ arụ mana o nweghị onye dunyere ya kwuo ya bụ ihe.
SP Ndukwe kọwara na akpupuru Mrs Alo n’ụlọ ikpe maka ebubo ndị gụnyere iji ụzọ aghụghọ kwuo na ya nwetara ihe, imebi aha mmadụ nke akpọrọ defamation of character tinyere ububo ire akụnụba nke na abụghị nke ya.
Emechara náà ya mkpanaka ma higharia ikpe ahụ ka ọ dị n’abalị itoolu nke ọnwa anọ bụ April n’afọ a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.