INEC ewepụtala usoro ntụliaka governorship election ga-esi gaa na Anambra State.
Written by Onyinye on March 13, 2025
Dịka aga anọrọ n’abalị asatọ nke ọnwa Novemba n’afọ a were chịkọba ntụliaka governorship election na Anambra Steeti, ugo eberela na mgbagbu dịka otu ndọrọndọrọ All Progressives Congress yana ogbo ha bụ Labour Party na-eme ihe ike kwere ha iji chụpụ otu All Progressives Grand Alliance APGA nọkwa ọchịchị nke state ahụ.
Ụlọrụ n’ahụ maka ntụliaka ọchịchị n’ala anyị bụ independent national electoral commission INEC ekwupụtala na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche ga e sonyere na ntụliaka ahụ ga amalite ntụliaka ime ụlọ ha n’abalị iri abụọ nke ọnwa March ma chịkọo ọnụ n’abalị iri nke ọnwa April.
Onye ji ọkwa national commissioner nyere ụlọrụ INEC ma bụrụkwa onye ji ọkwa chairman nke otu committee information and voter education bụ Sam Olumekun kwupụtara nkea nyere ọhaneze n’oge ọ na-eme ka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ahụ mata mkpa ọ dị na ha ghasoro ntụziaka ahụ etu e siri hazie ha. O kwudosiri ike na ntụliaka ahụ ka ga-ewere ọnọdụ n’abalị asatọ nke ọnwa Novemba n’afọ a.
Dịka ụlọrụ INEC siri kwupụta, otu ndọrọndọrọ ọchịchị iri na abụọ n’ime iri na itoolu e nwere n’ala anyị ewepụtala akwụkwọ ka ha ga-esi mee ntụliaka ime ụlọ ha maka onye ga a zọro ha ya bụ ọkwa nke gọvanọ.
INEC gbakwunyere na ime ihe na mgbe ya ga e nyere ha aka ị nyocha akwụkwọ ndị ahụ nke ọma dịka na alaka Section 84 nke iwu na-achịkwa ntụliaka ọchịchị n’ala anyị akpọrọ Electoral Act nke afọ 2022.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.