Ndi ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency NDLEA nakwa ụlọ ọrụ First Lady Enugu State ejikọla aka ọnụ weputa atụmatụ iji buo agha megide ọgwụ ike.

Written by on May 23, 2025

Dika mba ụwa nile mmerubere mmemme 2025 International Day of the Boy Child na abalị iri na ịsịị n’ọnwa May anyị nọọ n’ime ya, ndị Isi-Ụzọ LGA, ndi ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency NDLEA nakwa ụlọ ọrụ First Lady Enugu State jikọrọ aka ọnụ weputa atụmatụ iji buo agha megide ọgwụ ike ma merube mmemme ike nke nwa nwoke.

Isiokwu yabu mmemme bu Mgbanwe zuru oke nakwa mmepe: Iwulite ugwu onwe n’ime ụmụ nwoke, bu nke were ọnọdụ na Isi-Ụzọ Council Headquarters dị na Ikem, ma buru nke mbụ ana emerube yabu mmemme Boy Child Day na mpaghara ahụ.

N’okwụ ya, ka First Lady Isi-Ụzọ LGA bu Odoziaku Onyinye Obeagu, kwupụtara obi nwute ya, ihe ọgwụ ike na eme ụmụ na eto-eto ya nakwa mkpa ọ dị ijikọ aka ọnụ buo agha megide ọgwụ ike.

Odoziaku Obeagu mere ka amata na iso ndị ụlọ ọrụ NDLEA jikọ aka ọnụ ga ebenata etu esị ekesa ọgwụ ike na Isi-Ụzọ ya nakwa State a gba gburugburu.

Ndị nnọchitere anya First Lady Enugu State bu Odoziaku Nkechinyere Mbah nakwa Barrister Chidimma Egeọnụ, bu onye enyemaka pụrụ iche n’ihe gbasara ozi pụrụ iche, toro ndị ọnụ n’eru n’okwu na Isi-Ụzọ maka mbọ ha na agba n’ebe ụmụ ntorobịa nọọ.

Onye Deputy Commander, Drug Demand Reduction Unit nke ụlọ ọrụ NDLEA na Enugu State Command bu Mazi Ibezimakor Ọwunwa, kọwara mmemme ahụ dika nke a na enwetụbeghị ụdị ya n’ime afọ iri abuo na ịsịị ọ rụrụ ọrụ.

N’okwụ nke ya, ka Hon. Gabriel Eze, onye na anochite anya Isi-Ụzọ na Enugu State House of Assembly, kenere ndị weputara atụmatụ ahụ ma kwe nkwa ihụ na ndi ọgwụ ike na enye nsogbụ wetara onwe ha.

Ebe onye eze ọdinani nke Ikem-Ụnọ Autonomous Community bu His Royal Highness Igwe Okey Ogbodo, kwuputara obi nwete ya etu ọdachi ọgwụ ike si akawanye njọ na mpaghara ahụ.

Onye isi oche nke Isi-Ụzọ LGA bu Hon. Obiọra Obeagu, kenere government state a nakwa ụlọ ọrụ NDLEA maka enyemaka ha, ma kwe nkwa ikwado ụmụ akwụkwọ mere nke ọma n’ihe omume ahụ.

Ihe kachasị pụta ihe na mmemme ahụ bu atụmatụ eguzobere na mbu, nke bu War Against Drug Abuse WADA Clubs na ụlọ akwụkwọ Government Secondary Schools nile enwere na Isi-Ụzọ LGA site n’aka ụlọ ọrụ NDLEA bu nke na agbasa ozi ma na akwalite ezi obibi ndụ n’ime ụmụ akwụkwọ.

Ndị ọbịa pụrụ iche sonyere na yabu mmemme gụnyere, Dr. Ụzọamaka Okenwa, Technical Adviser on Gender Affairs, Dr. Collins Ogbu, SSA to the Governor on Strategy, Odoziaku Chidiebere Okonkwo, Assistant State Commander, Enugu-Ezike Area Command, Mazi Chidi Egbogu, Former SA to the Governor on Drugs and Narcotics nakwa Obinna Amadi, Assistant Superintendent of Narcotics tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited