Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State ezipula ndi olu ga achoputa ndi gburu otu onye olu NUPENG na state a.

Written by on May 24, 2025

Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State ezipula ndi olu ga achoputa ndi gburu otu onye olu n’ ulo olu Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas workers bu onye nke enyedebere aha ya dika Cosmas.

Ndi nta akuko nwetara ozi,na ndi ana enyo enyo na ha bu ndi ekperima ji egbe gbagbuo Cosmas na mpaghara Emene nke state a n’ abali ubochi Tuesday n’ oge nwa amadi a n’ abata olu.

N’ ozi onyefere ndi nta akuko bu otu onye rioro ka aghara ikpo aha ya n’ ikuku kowara n’ obu ndi oji egbe choro izuru ugboala nwa amadi a noro n’ oge yana ha n’ enwe nghotahie gbagbuo ya n’ ike.

Onye ozo bu nke nyere aha ya dika Johnson gwara ndi nta akuko,na ndi bi na mpaghara ahu nuru uda egbe ma gbaputa ebe ahu bu ebe onoro zute Cosmas ka otogboro n’ ekwo obara.

Na nke ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu SP Daniel Ndukwe bu onye nke choputagoro maka odachi a, noro n’ ozi nzaghachi ya nyere ndi nta akuko unya bu Thursday kowa odachi a dika igbu ochu ma mekwa ka amata na ndi uwe oji amalitego isi imi nnyocha n’ ala banyere nkea.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited