Ndị uweojii na Imo State ebutuola Sergeant Anayo Ekezie n’okwa.
Written by Onyinye on May 9, 2025
Ndị uweojii na Imo State ebutuola Sergeant Anayo Ekezie n’okwa dịka Corporal kwere maka na aka ya dị na mkpari akpariri otu nwoke n’okporo uzọ Owerri-Aba Road bu nke ahutara n’ihe onyoonyo n’efeghari n’uwa ozi.
Onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu DSP Henry Okoye mere ka nkea puta ihe na abalị ụnya bu Wednesday, dika omere ka amata aha ndị uweojii ahụ aka ha dị n’ọba ekere ede, ndị gụnyere, Inspector Ofem Obongha, Inspector Obinna Okereke nakwa Sergeant Anayo Ekezie bu ndị sitere na Safer Highway Unit bukwanu ndi achọpụtara ma kpụga ha na nyocha orderly room trial.
Na nyocha ahụ ka achọpụtara na ikpe mara Ekezie bu ihe kpatara ejiri butuo ya n’ọkwa, ebe Inspectors Obongha nakwa Okereke bu ndi abaara mba nke ukwuu kwere maka ịghara ịnọgide na-ahụ maka nlekọta kwesịrị ekwesị bu nke kpatara omume ahụ na-adịghị mma.
Commissioner ndị uweojii na State ahụ bu CP Aboki Danjuma, katọrọ omume ndị uweojii ahụ n’ebe ọdị ukwu, dika ọ kọwara na omume ha megide iwe na achịkwa ndị uweojii nakwa ikike mmadụ nwere, omere ka amata na ha agaghị anabata ajọ akparama agwa site n’aka onye uweojii ọbula ma kwe nkwa na onye uweojii ọbula ahutara n’ajọ akparama agwa dị etuahu ga enweta ntaramahụhụ kwesịrị ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.