Nwaanyị onye ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood bụ Nkechi Nweje alala mmụọ.
Written by Onyinye on March 24, 2025
Nwaanyị onye ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood bụ Nkechi Nweje azala oku chi ya kpọrọ ya n’ụbọchị Friday nke ịzụ ụka anyị pụrụ n’ime ya ka ọ rịachara ahụ obere oge.
Ọnwụ banyere nwaanyị ahụ ka emere ka ọ pụta ihe site n’ọnụ onye otu ya bụ Stanley Ajemba onye ana etu Stanley Ontop n’ozi o zipụrụ ụnyaahụ bụ Saturday.
Na ya bụ ozi ozipuru na ọwa ozi Instagram ka ọ gbakwunyere eserese nwaanyị ahụ wee dee si na otu Nollywood enwetala onwe ha na ọnọdụ nke iru uju ọzọ.
Stanley Ajemba kwara arịrị banyere ọnwụ nwaanyị ahụ bụ onye o kwuru na enweghị obi ide ozi banyere ọnwụ kworo maka ọka dị ya bụ na nrọ bụ nke ezigbo nwaanyị onitsha dịka osiri kpọọ ya.
Ndị Nkechi Nweje hapụrụ laa mmụọ gụnyere di ya ụmụ ya mmadụ isii.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.