ODUMEJE EYIE EGWU ONWU GAARA NDI NKATO YA

Written by on September 11, 2024

Onye General Overseer nke ogige ekpere Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dina Onitsha nke Anambra State bu Pastor Chukwuemeka Ohanaemere amakariri dika Odumeje ma obukwanu Indaboski Bahose adola aka na nti dosia ya ike dogara ndi okowara na hana akato ya site n’ owa ozi social media.

Na ozi onyonyo yabu Odumeje weputara taata bu Wednesday ka nwa amadi a noro si na ya anaghikwa agbagara ndi nchekwa maka ibu agha buso ndi n’ achu ya.

Odumeje yiri egwu si na ya ga eji ike nke mmuo napu ndi ahu n’ akatosi ya ndu ha ma oburu na ha akwusighi iji ya mere ihe nkato n’ owa ozi mmekorita ohaneze.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies