Ọkụ egwu ama ama bụ Daddy Showkey agwala aka na-achị Niger state bụ Gov Umar Bago ká ọ kpụọ afọ ọnụ ya tupu onye iwu ka amalite ịnwụchi ndị bu isi dada.

Written by on April 25, 2025

Daddy Showkey nke na-akụ egwu n’ala anyị akatola aka na-achị Niger state bụ Gov Umar Bago maka ntụziaka nke o nyere ndị ọrụ nchekwa na state ahụ sị ka amalite ịnwụchi onye ọ bụla ahụrụ nwere isi dada.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na onye aka na-achị state ahụ nyere ya bụ iwu n’ụbọchị Tuesday n’oge yana ndị ọrụ nchekwa nwechara ọgbakọ ha.

O kwuru na nzọụkwụ ahụ bụ otu ụzọ ọchịchị ya chọrọ isi kpochapụ ndị ekperima kpamkpam na Minna bụ isi ọchịchị nke State ahụ.

Na nzaghachi site na ọwa ozi Instagram ka Daddy Showkey bụ onye nwere isi dada ahụ ana ekwu maka ya jụrụ ma ọ bụ ntutu isi dada bụ ya n’akpata ajọ ọnọdụ nchekwa.

Dịka ọ nọrọ n’oge ahụ kagbuo njem ọ kara ime gaa Niger state bụ maka iwu ọhụrụ ahụ ka Daddy Showkey gwara Gov Umar Bago ka o buru ụzọ kpụọ afọ ọnụ ya tupu ọ chụghariwa ndị bu ntutu isi dada ka ọ kpụọ ha isi.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited