Regina Daniel nke na-eme ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood ekposala owa ozi Instagram ya kwuru maka na di ya bu Ned Nwoko enwetala nwa ohuru site n’aka nwaanyi ozo bu Chika Ike

Written by on February 18, 2025

Regina Daniel nke na-eme ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood ekposala ọwa ozi Instagram ya dịka na efegharị sị na di ya bụ Ned Nwoko enwetala nwa ọhụrụ site n’aka nwaanyị ọzọ bụ Chika Ike.

Okwu akpụ n’ọnụ ka ọ dị ugbu a na ọwa ozi ọgbara ọhụrụ bụ na Chika Ike onye kwupụtara banyere nwa ọhụrụ ya ga anọrọ n’oge na-adịghị anya kwaba n’ụlọ onye aka ji akụ ahụ dịka nwunye ya ọhụrụ.

N’ihe yiri dịka nzaghachi ya nyere okwu ndị a niile ka Regina Daniels onye na apụtabeghi ihe na ọwa ozi kemgbe a nụrụ akụkọ banyere nwa ọhụrụ ahụ nọrọ ụnyaahụ bụ Monday kpọsaa ọwa ozi ya na Instagram.

Onye ihe nkiri onyonyo ahụ dịka aga asị na yana di ya bụ Ned Nwoko na-enwe ihe nghọtahe na alụmdi na nwunye ha.

Ịga echeta na Regina Daniels onye gbara afọ iri abụọ na anọ lụrụ Ned Nwoko onye gbara afọ iri isii na anọ ma bụrụ aka ji akụ n’ọnwa April afọ 2019. Ebe Chineke jikwa ụmụ nwoke abụọ gọzie alụmdi na nwunye ha.

Ruo ugbu a mmadụ abụọ ahụ enwebeghi ihe ha gwara ọhaneze banyere ọnọdụ ha n’okwu ahụ na ewughari ebe niile. Mana ọpụpụ Regina Daniels pụrụ na ọwa ozi abịala mee ka ndị nkwado ya chịrị uche ha n’aka.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies