Ufodu ndi nwere nsogbu nke inu ihe na mpaghara ala Igbo be anyi a, enwatara akuru ngwa enyemaka ruru nde kwuru nde naira.

Written by on April 12, 2025

Ufodu ndi nwere nsogbu nke inu ihe na mpaghara ala Igbo be anyi a, enwatara akuru ngwa enyemaka ruru nde kwuru nde naira site n’ aka otu enyemaka akporo Sound Intervention Hearing Mission 2025 na Abia state.

Na yabu mmeme ejiri nyefe ha ihe onyinye ndia ,bu nke were onodu na ogige International Conference Center Dina ogurube Umuahia,ka aka n’ achi Abia state bu governor Alex Otti tinyekwara nwa amadi ahu jiburu okwa onye isi ala Nigerian bu former President Olusegun Obasanjo noro gbape atumatu ato maka nlekota nakwa nke enye m aka govt Abia state gara ndi a nwere nsogbu.

N’ okwu ya na yabu mmeme,ka Governor Otti noro me ka amata na atumatu ya maka ngalaba aru Ike bu iruputa ezi usoro digasi iche iche gana ahu maka nkpa ndi nogasi n’ ime Obodo na state ahu ma burukwa nke ga adi onu ala.

Omekwara ka amata na ochichi state ahu amalitego olu n’ ulo olu alu Ike di nari ato n’ ime okpuru ochichi ime Obodo iri na asaa enwere na state ahu,site n’ idozighari okporo uzo,oku electric nakwa onodu nchekwa bu igba,ma ahazikwa ufodu ihe ndi nwere Ike ibuta nkpobi ukwu nyere ndi mmadu inweta ezi nlekota aru Ike ha.

Okowara na atumatu ohuru okporo triple barreled initiative ga enye aka n’ ebe odi ukwuu gara ndi mmadu nakwa ezi n’ ulo di iche iche, okachasi ndi olu oyibo state ahu ilokota aru Ike ha, Tinyekwara usoro nke enweburu akporo sector health insurance scheme.

N’ aka nke ya,ka former President Olusegun obasanjo noro too governor Alex Otti maka uchu onwere ititeghari ngalaba di iche iche nke state ahu ma n’ akowakwa na atumatu ya nile gbadoro anya n’ ohere olu gara ndi ntorobia, ngalaba agu m akwukwo nakwa nke aru Ike.

Chief Obasanjo mekwara ka amata na otutu umu afo Nigeria bu ndi nke no n’ ihe aka mgba nke oria anuchaghi ihe ofuma kwere maka na ha emego okenye, nakwa otutu ihe ndi ozo sitere na nyanya, ma n’ akpoku govt n’ ogogo nile,ka gbatara ndi di etu a oso enye m aka iji soro ibe ha n’ ebi ezi ndu.

Na nkuzi banyere etu aga esi gbochie nsogbu anuchaghi ihe a, ka otu onye oka mmuta ma buru onye isi na ngalaba n’ ahu maka nti nakwa uwa akpiri n’ ulo ogwu University of Nigeria teaching hospital Enugu bu Prof Basil Ezeanolue noro gwa umu nwanyi muru nwa ohuru ka ha bido n’ oge n’ ihe dika onwa isii, n’ enelu umu ha anya etu ha si anu ihe iji choputa ma gbochie nsogbu nke anuchaghi ihe ndi mmadu n’ enwe ugbua.

Omekwara ka amata na mmadu ime okenye nwekwara Ike ikpata ya kama onyere umu afo Nigeria ndumodu ka ha kpachara anya n’ udi ndi ha n’ ebi iji gbanariri idanye n’ ihe aka mgba nke oria nti.

Na mbu n’ okwu ya ka onye ji okwa executive secretary,Abia state health insurance Agency bu Dr Chidozie egwuonwu noro kowa atumatu formal health insurance scheme dika ngosiputa uchu gov Otti nwere maka odi mma onodu aru Ike umu afo Abia state tinyekwara igbochi onwu erughi eru.

N’ okwu ya n’ aha ndi ritere erere yabu akuru ngwa enyemaka,ka Rev sister ogechukwu ugwu sitere Enugu State noro kene ndi chikobara ogbako a maka ezi igbanwe nyere ndu ha.

Onye nta akuko anyi bu chukwuma Philips nwetara ozi na anoro na yabu mmeme nye ndi mmadu ogwugwo oria, nnyocha anya, nkuzi banyere ezigbo nri n’ edozi aru n’ efu tinyekwara onyinye akulungwa eji anu ihe ekere ndi mmadu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited