Ụlọ akụ mba ụwa bụ World Bank ebuola amụma were si na oke agụụ na ụbịam ga amụbanye n’ala anyị bụ Nigeria malite n’afọ 2027 na-abịa.
Written by Onyinye on April 25, 2025
Ụlọ akụ mba ụwa akpọrọ World Bank nọrọ ụnyaahụ bụ Thursday were kwuo sị na agụụ na ụbịam nke eriwe ma afọ ejula ga amụbanye n’ala anyị bụ Nigeria site ihe ruru percent atọ na ụma isii malite n’afọ 2027 rue ihe ruru afọ ise ọzọ na abịa.
Nkea pụtara ihe taa n’oge ọgbakọ hana ogbo ha nke IMF nwere obodo Washington DC nke mba United States.
Ha kwuru n’agbanyeghị elele nke ala anyị nwetagoro na ngalaba ndị ọzọ na abụghị ngalaba mmanụ, na ihe ndị gụnyere etu esi ahazi akụnụba ndị a yana oke ndabere n’otu ihe bụ ya ga-eme ka ihe ọbụla kpụọ afọ n’ala.
World Bank mechara tụọ alo ka ọchịchị etiti jikọọ aka ọnụ hazigharia ọnọdụ akụnụba site na ngalaba dị iche iche iji gbochie ajọ ọnọdụ ahụ na-abịa n’ọdịnihu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.