Ụlọikpe dị na mba Spain emechala nọrọ n’ikpeazụ kwuo na ikpe mara Lius Rubiales bụbu onyeisi oche otu egwuregwu bọọlụ na mba Spain maka ibi otu nwaanyị onye egwuregwu ya ọma ma susuo ya ọnụ.

Written by on February 21, 2025

Nwa amadi ahụ jibu ọkwa President nyere otu egwuregwu bọọlụ na mba Spain bụ Lius Rubiales abụrụla onye amara ikpe maka ibi otu nwaanyị onye egwuregwu ya ọma ma susuo ya ọnụ.

E kwuru na nwoke ahụ ga akwụ nra ego dị puku pound iri na narị asatọ maka ya bụ agwa ọ kpasoro nwunye onye ọzọ.

Mana ha kwuru n’ikpe amaghị nwoke ahụ yana mmadụ atọ ndị ọzọ na ebubo nke e kwuru na o jiri aka ike were mee ya.

Nwaanyị egwuregwu bọọlụ ahụ e nyere aha ya dịka Hermoso kwudosiri ike na ọ bụghị nkwekọrịta yana nwoke ahụ ibi ọma ma ọ bụ susuo ọnụ n’oge ahụ mba Spain nọrọ turu ugo asọmpi iko mba ụwa afọ 2023 nke ụmụ nwaanyị were ọnọdụ na mba Australia.

Ya bụ ebubo bụkwa ya mechara mee nwoke ahụ ka ọ gbaa arukwaghim nọkwa ọrụ ya dịka onye President nke otu Spanish football federation.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies