Ụlọrụ n’ahụ maka ọkụ latric n’ala anyị akpọla oku ka amara ihe e mere kpụpụ ndị ahụ anwụchiri maka ị zuru akọrọ ngwa ọkụ latric na Enugu n’ụlọ ikpe iji nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha.

Written by on February 20, 2025

Ụlọrụ n’ahụ maka ọkụ latric n’ala anyị bụ Nigerian electricity distribution company ngalaba ha nke akpọrọ main power electricity distribution company limited akpọla oku ka e mee ngwangwa nye ndị ahụ ntaramahụhụ kwesịrị ha bụ ndị anwụchiri maka ịwakpo akọrọ ngwa ọkụ latric na Enugu state.

Ọkpụkpọ oku a bịara n’oge ndị nlekọta nke ụlọrụ ahụ nke onye ndu ha bụ Ernest Mupwaya ji ọkwa managing director ha mere njem ha bịa na nke Commissioner n’ahụ maka ikpe nkwụmoto ma bụrụkwa onye ji ọkwa attorney General nke Enugu state bụ Kingsley Udeh.

Mupwaya jiri ohere ahụ were rịọ gọọmenti ka e mee ngwangwa nye ndị ahụ anwụchigoro ntaramahụhụ kwesịrị ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nyere ndị ọzọ tinyere ịmepụta iwu ọhụrụ ga egbochi ndị ekperima ị dina ezukoro akọrọ ngwa ha.

O mechara kelee ministry n’aha ndị otu ya maka nkwado yana ndonye ukwu ha nyegoro ụlọrụ ya.

Ebe ogbo ya nke onye Commissioner for justice yana attorney General na Enugu state bụ Kingsley Udeh mechara kwupụta ndonye ukwu ha nyere ụlọrụ ahụ na-enye ọkụ latric oge ọbụla ha chọrọ ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited