Umu nwanyi n’ azu ahia na mpaghara Warri achikobara mmeme ncheta omumu ntumadi gara otu nwanyi onye uwe oji na Delta State.
Written by Onyinye on April 19, 2025
Otutu umu nwanyi n’ azu ahia na mpaghara Warri nke Delta state anorola tata bu Friday chikobara otu nwanyi onye uwe oji bu onye nke enyere aha ya dika Mercy Uche mmeme ncheta omumu ntumadi n’ oge ono n’ iru olu.
N’ ihe onyonyo eweputara site na yabu mmeme ka anoro huta yabu nwanyi onye uwe oji ka ono n’ akpata oyi dika ana eti igba ma n’ akukwa egwu di iche iche, tinyekwara ndi ahia n’ agba egwu agba ya okirikiri ma n’ efekwa ya ego iji kene ya.
Yabu mmeme were onodu n’ otu okporo uzo n’ ekwo ekwo ma burukwa ebe anoro huta officer Uche n’ ebe oka n’ arukwa olu ya dika yabu mmeme n’ aga n’ iru.
Mmeme a bu nno nke dotara nkwuwa okwu otutu umu afo Nigeria n’ owa ozi bu ebe ha no n’ eto yabu nwanyi onye uwe oji maka ezi akpara m agwa ya nakwa ihunanaya ndi ahia ahu gosiri ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.