Ndi otu Arab enwela nkwekorita iruzighari Gaza’s strip n’ ime afo ise.
Written by Onyinye on March 5, 2025
Ndi ndu otu Arab enwela nkwekorita na atumatu iji Ijeri Dollar iri ise na ato ruzuharia mpaghara Gaza n’ ime afo ise n’ achupughi ndi bina Palestine, iji gbagha atumatu ahu onye isi ala mba America bu President Donald Trump jiri cho iweghara isi Obodo mba ahu
Mba Israel ,bu ndi nke no kemgbe egbochi ibubanye nri, ogwu nakwa akulungwa ndi eji enyere ndu aka ibanye na mpaghara Gaza’s strip katoro atumatu ahu Donald Trump ji,ebe isi ulo olu white house mere ka amata na Donald Trump ka kwudosikwara Ike na atumatu ahu oji banyere Gaza’s strip.
Otu isi ekwe Hamas mere ka amata na obi bu ha so anuri na atumatu ahu mba Egypt eweputara ma na anabatakwa oku ahu ana akpo maka ichikoba ntuliaka ochichi ndi ulo nzuko omebe iwu nakwa nke onye isi ala n’ oge n’ adighi anya.
Ndi olu aru Ike nke mpaghara Gaza’s strip ekwuputara onwu umu afo Palestine mmadu di puku iri ano na asato, nari ato na iri asato na asato nwuru na agha ahu mba Israel buru bata na Gaza,ebe ndi nke di otu nari puku na iri na otu, nari asato na ato nwetara ihe mmeru aru.
Ndi olu nta akuko govt mba ahu n’ aka nke ha weputakwara nguko ha n’ akowa na onu ogugu umu afo mba Palestine ndi nwugoro anwu na mba Israel agbagogo na puku iri isii na otu, nari asaa na itolu , mmadu di otu puku, otu nari na iri ato na itolu bu ndi nke egburu egbu n’ agha mwakpo ahu mba Israel malitere na abali asaa nke onwa October afo 2023.ebe mmadu ruru nari abuo ka eji eji.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.